Hebrews 5

1A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka ọ na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche. 2Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume. 3Nʼihi nke a, ọ ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ. 4O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn.

5Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya,

“Ị bụ Ọkpara m.
Taa abụrụla m Nna gị.” a
6Nʼebe ọzọ, o kwuru,

“Dị ka usoro Melkizedek si dị,
ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.” b
7Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya. 8Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara. 9Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi. 10Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.

Ịdọ aka na ntị banyere ịdapụ nʼokwukwe

11Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ anyị nwere ikwu banyere ya, ma o siri ike ịkọwa ya nʼihi na unu adịghị amụta ihe ọsịịsọ. 12Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike. 13Onye ọbụla nke na-aṅụ ara, ka bụ nwantakịrị, ọ matabeghị ozizi banyere ezi omume. 14Nri dị ike dịrị ndị tozuru oke, ndị siterela nʼihe ha na-eme zụọ onwe ha ịchọpụta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe.

Copyright information for IboBIU